ÓKÉ NGWAKỌTA ASỤSỤ IGBO NA BEKEE: NDỌGHACHI AZỤ NYE NKWALITE ASỤSỤ NA OMENALA IGBO

Main Article Content

Nkechinyere Ohaike

Abstract

Dị ka mmiri siri bụrụ ndụ azụ ka asụsụ siri bụrụ ndụ obodo. Asụsụ bụ ngwa mmadụ na ibe ya ji emekọrịta nʻogo nziritaozi, mmepe, ngosi agbụrụ dgz. Ọ bụ ezinụlọ, agbụrụ na obodo ka ọ dịịrị ịsụ na ijikwa asụsụ ha nke ọma iji nwee ugwu na nsọpụrụ n’ebe agbụrụ na mba ndị ọzọ nọ ma nwee ike nyefee asụsụ na omenala ha kwụ chịm n’aka ụmụ na ụmụụmụ ha. Tupu ndị mbịrachịwa abata n’ala Igbo na tupu alụọ agha Naịjirịa na Bịafra, asụsụ Igbo bụ asụsụ ndị Igbo ji aña isi jirikwa ya eme ihe ha niile n’ozuzu oke. Ka ọ dị taa, ọraka ahụ inweta nʻụlọ, ụlọ akwụkwọ, ụlọ ọrụ na ọgbakọ dị iche iche, ebe a ga-asụ Igbo site na mbido ruo na ngwụcha n’agwakọtaghị mn’ebe ọ karịrị akarị Igbo na Bekee (Ingiligbo). O doro anya na onweghi asụsụ ọbụla ya na asụsụ ibe ya na-adịghị adarịta obi mana nke Igbo karịziri akarị. Anyị chịkọtara ọtụtụ nkebiokwu, nkebiahịrị na ahịrịokwu a gwọkatara Igbo na Bekee site nʻụgbọ njem, ahịa, ụlọ akwụkwọ nakwa ụlọ ụka. Atụtụ anyị gbasoro mee nchọcha bụ nke Peter Trudgil. Atụtụ a na-akọwa na asụsụ bụ usoro dị mkpa iji hiwe ma hazie mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Edemede a na-akpọ oku ka ọhaneze na-asụ Igbo ma nwee mkpụrụokwu ọbụla ha chọrọ n’ọba mkpuruokwu ha iji were na-ekwu ma na-akọwa ihe ha chọrọ n’asụsụ Igbo. Nke a ga-eme ka anyị hapụ ịbụ agbụrụ dị ndụ asụsụ ha nwụrụ anwụ.

Article Details

How to Cite
Ohaike, N. (2024). ÓKÉ NGWAKỌTA ASỤSỤ IGBO NA BEKEE: NDỌGHACHI AZỤ NYE NKWALITE ASỤSỤ NA OMENALA IGBO. Journal of Nigeria Languages’ Studies (NILAS), 4(2), 259–266. Retrieved from https://nilas.com.ng/index.php/nilas/article/view/93
Section
Articles