Emume Àjụ́ N’obodo Ugwulangwu Nke Steeti Ebọnyị
Main Article Content
Abstract
Ọrụ nchọcha a lebara anya n’emume Àjụ̣́ n’obodo Ugwulangwu nke steeti Ebọnyị. Ebumnuche nchọcha a bụ ịchọpụta ka emume Àjụ̣́ nke ndị Ugwulangwu si malite; ileba anya n’usoro emume Àjụ̣́ nke ndị Ugwulangwu; ịchọpụta uru emume Àjụ̣́ nke ndị Ugwulangwu bara na ịmata ọghọm dị n'emume Àjụ̣́ nke ndị Ugwulangwu. Usoro nnweta njiatụle bụ site n’ịgba ndị a họpụtara ajụjụ ọnụ. E jikwa atụtụ ndịnọrụ rụọ ọrụ na nchọcha a. Emume Àjụ̣́ bidoro n’obodo Ugwulangwu site n’agha ndị obodo Ugwulangwu na ndị mpaghara Ọhaọzara ndị ọzọ lụrụ. Ha kwenyere na anwụrụ ọkụ si n’ihe a na-akpọ ẹkị̀rị̀kọ n’obodo Ugwulangwu kpuchitere ha n’aka ndị iro bịara ibuso ha agha. Ha kpokọrọ ntụ ẹkị̀rị̀kọ̣́ ahụ, chụọrọ ya aja, gụọ ya Àjụ̣́ Ugwulangwu, ma kwekọrịta na a ga na-eme emume Àjụ̣́ kwa afọ iji chụọrọ ntụ ẹkị̀rị̀kọ̣́ ahụ aja ma chetara ya ọrụ ọma ọ rụụrụ ha site n’ikpuchite ha n’aka ndị iro ha. E lebara anya n’usoro emume Àjụ̣́ nke ndị Ugwulangwu nke gụnyere ịpịa ji nzu, Nkwọ Ẹgụnwagbọọ, ịzụ ahịa Orie Àjụ̣́, mmemme alụmdi na nwunye, Eke Àjụ̣́, Orie Afọ Àjụ̣́ na Nkwọ Àjụ̣́ (mkpọkọrọ Nkwọ). A chọpụtara uru emume Àjụ̣́ nke ndị Ugwulangwu bara dị ka nkwalite ezi mmekọrịta n’etiti mmadụ na ibe ya nakwa ime ka ezinụlọ mata onwe ha. A hụtakwara ọghọm dị n’emume Àjụ̣́ nke ndị Ugwulangwu na nchọcha a nke gụnyere oke mmefu ego nakwa mbute oke ekworo na anya ụfụ n’obodo.