NZIKỌRỊTA OZI N’ASỤSỤ NAỊJIRỊA: ỤZỌ KACHA MMA MAKA NCHEKWABA ASỤSỤ IGBO NA OGBO YA NDI ỌZỌ

Main Article Content

Edith Ngozi Onukawa

Abstract

Asụsụ bụ otu n’ime ihe gbapụtakarịchara ihe Chukwu okike ji chọọ mmadụ mma ma mee ya ọpụrụiche n’ebe ihe niile ndi ọzọ o kere eke dị. Naanị mmadụ na-ekwu okwu nwere nghọta ma nwekwaa ike ịkọwa ụzụ ihe okike ndi ọzọ na-eme. Agbụrụ dị iche iche jupụtara n’ụwa taa nwere asụsụ ha, bụ njirimara ha. N’obodo Naịjirịa, e nwere ọtụtụ agbụrụ na asụsụ dị iche iche e ji mara ha. Asụsụ ndị a niile bachaara ndị na-asụ ha uru mana atọ n’ime ha bụ: Yoruba, Hausa na Igbo kacha pụta ihe n’ihi na e kwenyere na ọnụọgụgụ ndị na-asụ ha dị ukwuu karịa ndị ọzọ. Ọ bụ iji hụ maka agamnihu asụsụ atọ ndị a ka e ji hiwe nnukwu ụlọakwụkwọ a nke a kpọrọ The National Institute for Nigerian Languages, Aba, Steeti Abia n’afọ 1992. Nchọcha a gbadoro ụkwụ n’ileba anya n’uru dị n’iji asụsụ ndị dị n’obodo anyị bụ Naịjirịa tụmadị Yoruba, Hausa na Igbo na-ezikọrịta ozi n’ogo dị elu iji nyere obodo Naịjirịa aka ikwudobe na mba ụwa dum. A ga-agbaso usoro nkọwa ji kọwapụta isiokwu nchọcha a nke ọma. Site n’ihe dị n’ọbaakwụkwọ na ajụjụ ọnụ oka a ga-esi nweta ntụnye uche ga-enye aka n’ịkọwapụta isiokwu nchọcha a otu o kwesịrị. Ụfọdụ nchọpụta nchọcha a ga-egosi na iji asụsụ Naịjirịa ezikọrịta ozi nwere oke uru si na ya apụta nke gụnyere: ịdị n’otu, udo, ihunanya, ọganihu na ezi nchekwaba ndụ. Nchọcha a na-atụ aro ka ndi obodo Naịjirịa nwee otu obi ka asụsụ anyị ndi a bụrụ ihe ga-ejikọta anyị ọnụ, ọ bụghị itisa anyị. Na nchịkọta, ka anyị jisie ike tinye ntụpụta ndị a n’ọrụ ka asụsụ anyị ndi a nwee ike ikwudobe asụsụ ndi ọzọ n’ụwa dum maka ezi nzikọrịta ozi.

Article Details

How to Cite
Onukawa, E. N. (2024). NZIKỌRỊTA OZI N’ASỤSỤ NAỊJIRỊA: ỤZỌ KACHA MMA MAKA NCHEKWABA ASỤSỤ IGBO NA OGBO YA NDI ỌZỌ. Journal of Nigeria Languages’ Studies (NILAS), 4(2), 125–130. Retrieved from https://nilas.com.ng/index.php/nilas/article/view/48
Section
Articles