MWEZUGA MGBAGWỌ ECHICHE N’OLUNDỊ ẸZAA

Main Article Content

Emmanuel Emeka NWAOKE
Adaora Maudline Eze
Goodluck C. Nwode

Abstract

Nchọcha a zipụtara ụzọ dị iche iche e si egosipụta mgbagwọ echiche na nzikọrịta ozi n’olundị Ẹzaa. Ndị nchọcha bagịdere nchọcha a n’ihi nghọtahie na nsogbu mgbagwọ na-ebute n’etiti mmadụ na ibe ya maọbụ obodo na ibe ya. Atụtụ a gbasoro mee nchọcha a bụ atụtụ ụtọasụsụ ọrụ na nrụtụmaka. Atụtu a hụtara asụsụ dịka ụzọ nzikọrịta ozi nke na-ezipụta ọnọdụ/nghọta mmadụ site na nnyocha ụtọasụsụ ọgbaraokwu ndị a tụlere. A tụlegharịrị ihe ndị nchọcha derela banyere isi okwu nchọcha a. Ọ bụ naanị ihe ndị metụtara mwezụga mgbagwọ n’olu Ẹzaa ka e lebara anya. Atụchapụtara mgbagwọ mkpụrụokwu, nke ọgbaraokwu, nke njikọ mkpọaha, nke mkpọpụta na nke atụmatụ okwu dị iche iche ndị a na-ahụta n’olu Ẹzaa ma zipụtakwa ụzọ dị iche iche e si ewezuga ha. Mkpụrụokwu ndị nwere myinsụpe na ụbara echiche bụ ihe ndị na-ebute mgbagwọ mkpụrụokwu ebe etinyeghị akara edemede ebe o kwesiri, njikọ na amaghị onye/ihennọchiaha na-arụga aka nakwa ndịiche echiche agbaala na agbaelu atụmatụ okwu dị iche iche bụ ihe ndị na-ebutekwa mgbagwọ ahịrịokwu. Mgbagwọ mkpọpụta na-apụta ihe mgbe ndokọ abụọ maọbụ karịa nwere otu mkpọpụta mana odide na echiche ha abụghi otu. Iji hụ na e nwere nghọta zuru oke na nzikọrịta ozi maọbụmkparịtaụka ọbụla n’olundị Ẹzaa, nchọcha a gosiri na ọnọdụ a nọ kwuo okwu na mgbakwụnye nnara, mmeju maọbụnkebiahịrị nye ahịrị nwere mgbagwọ so na ụzọ e si ewezuga mgbagwọ echiche.

Article Details

How to Cite
NWAOKE, E. E., Eze, A. M., & Nwode, G. C. (2024). MWEZUGA MGBAGWỌ ECHICHE N’OLUNDỊ ẸZAA. Journal of Nigeria Languages’ Studies (NILAS), 4(2), 114–124. Retrieved from https://nilas.com.ng/index.php/nilas/article/view/47
Section
Articles