NTỤCHA USOROOKWU NKEBIOKWU NKWỤSO N’ASỤSỤ IGBO
Main Article Content
Abstract
Nchọcha a tụchara usoro nkebiokwu nkwụso dịka o si apụta ihe n’asụsụ Igbo. Ọ bụ eziokwu na e meela ụfọdụ nchọcha banyere nkeji nkwụso n’asụsụ Igbo mana e nwebeghị nchọcha pụtara ihe banyere usoro nkebiokwu nkwụso n’asụsụ Igbo. Nkwụso bụ okwu nke na-akọwakarị aha mana ọ naghị enwe echiche n’onwe ya n’ihi na echiche ya na-esite na mkpụrụokwu maọbụ ọgbaraokwu ọ kwụdebere nso n’ahịrịokwu. A na-ahụtakwa ya n’ụfọdụ ndoko maọbụ ewumewu Igbo. E mere nchọcha a site n’ịgbaso atụtụ Oke-X. Atụtụ a na-arụga aka nye akara, aha maọbụ osonye nke na-abụ a gbakwụnye na ndebiri nkeji asụsụ o mee ya nkeji nnọnetiti nke karịrị otu okwu ma pekarịa nkeji ahịrịokwu. Usoro ahịrịokwu Igbo dịzịrị adịzị bụ nke na-enwe usoro isi ahịrị-ngwaa-nnara mana mgbe e wubere usorookwu nkebiokwu nkwụso, ndokọ ya na-enwe mgbatị nkwụso nke dị na nkebiokwu nke e kwesiri ịkpọ nkeji mkpọaha. A na-enwe ụdị ndokọ a n’ihi mgbatị nkwụso nke dị na nkebiokwu ahụ. Anyị hụtakwara na nkebiokwu nkwụsọ na-eji mkpụrụokwu dị na nkejiasụsụ ndị ọzọ dịka mkpọaha, nkọwa, aha nkọwa, ọnụọgụ dg arụ ọrụ.
Article Details
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial-NoDerivatives 4.0 International License.