OKE ỌDỊDA ỤMỤAKWỤKWỌ SEKỌNDỊRỊ UKWU N'ASỤSỤ IGBO N' ULE WAEC N'OKPURU ỌCHỊCHỊ IME OBODO UDI NKE DỊ NA STEETI ENUGWU
Main Article Content
Abstract
Nchọcha a bụ iji chọpụta ihe mere ụmụakwụkwọ ji adakarị n’ule asụsụ Igbo na WAEC n’okpuru ọchịchị Udi nke Steeti Enugwu. Ebumnuche nchọcha a bụ ịchọpụta ihe a ga-eji gbochie maọbụ kwụsị ụdịrị ọnọdụ a n’agụmakwụkwọ na Steeti Enugwu. Ịchọpụta ụmara ndị mmadụ n’ebe asụsụ Igbo dị, ịchọpụta ụdị nzere na ọzụzụ ndị nkụzi nwere n’asụsụ Igbo ya na ihe ndị ọhanaeze na ndị gọọmenti ga-eme iji hụ na e gbochiri oke ọdịda ụmụakwụkwọ n’asụsụ Igbo. Nka nchọcha e ji rụọ ọrụ bụ Sọvee Ṅkọwasị. Ọnụọgụgụ e ji mee nchọcha a dị puku atọ iri isii na ise (3065) ebe nsere e nwetara dị narị atọ (300). Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha a bụ akwụkwọ mgbamnjụ. A chọpụtara na ụfọdụ ndị nkụzi hapụrụ iji Igbo Izugbe na-akụziri ụmụakwụkwọ ihe ma were olundị obodo ha wee na-akụziri ụmụakwụkwọ Igbo Izugbe. E nweghị mmasị nke ụfọdụ ndị nkụzi na ụfọdụ ụmụakwụkwọ sokwa na nsogbu na-ebute oke ọdịda, tinyekwara na ụfọdụ ndị nkụzi Igbo enweghị ezigbo ọzụzụ n’ihe gbasara asụsụ Igbo tupu ha akụziwe n’ihi na ha weere ya na ebe ọ bụ na ha maara asụ asụsụ Igbo na ha ga-enwe ike kụzie asụsụ Igbo nke ọma.
Article Details
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial-NoDerivatives 4.0 International License.