AMỤMAMỤ ASỤSỤ, MMATA NA ỤBARA ECHICHE N’OLU ẸZAA
Main Article Content
Abstract
Mbunuche nchọcha a ịbụ ịtụcha mmata na nghọta echiche okwu ndị nwere ụbara echiche ma marakwa ka aha nnọchi na mbụrụ dị ka ngalaba amụmamụ asụsụ mmata si ebute ụbara echiche okwu n’olu Ẹzaa. Ọchọcha mere nke a site n’ileru anya na mmekọrịta dị n’agbata ụbara echiche, mbụrụ na aha nnọchi. Nchọcha a bụ nke ndịzima; ọchọcha gbasoro atụtụ mmado echiche site n’iji ọwa mmado zipụta ka e si ahụ na ka e si esekasị echiche ndị a. E sitere na nchọpụta e nwetara atụ aro na ọ dị mkpa ka ụbara echiche bụrụ nke ndị nchọcha malitere tụchaba site n’ịgbaso amụmamụ asụsụ mmata. Site na mgbaso amụmamụ asụsụ mmata, nchọcha a zipụtara na ọtụtụ okwu ndị nwere ụbara echiche na-esitekarị na mbụrụ ma ọ bụ aha nnọchi n’ihi na ha na-enwe echiche nkịtị na echiche miri emi. Nke a gosipụtara na aha nnọchi na mbụrụ nwere ụzọ ha si atụnye oke na mwube na mwegharị echiche okwu ndị nwere ụbara echiche. Nchọpụta anyị na-egosi na ụbara echiche okwu anaghị adabere naanị n’echiche aka ole na ole okwu na-enye kama ọ na-adabekwara na nchemi echiche okwu ọkachasị ndị sitere n’okwu e ji ewube mbụrụ na aha nnọchi.
Article Details

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial-NoDerivatives 4.0 International License.