NNYOCHA IHE ỌJỌỌ GBAA AFỌ SITE N’ỊGBADO ỤKWỤ N’ATỤTỤ NTỤCHA ỤBỤBỌ KEMPỤRỤICHE
Main Article Content
Abstract
Nchọcha a lebara anya n’iduuazị Ihe ọjọọ gbaa afọ nke Chinedum Ọfọmata. Ebumnuche ya bụ inyocha agwa ndị nwere ike, ịtụle agwa ndị a chịkwara na inyocha ụzọ dịgasị iche iche ndị nwere ike siri chịkwaa mmụọ na ụbụrụ agwa ndị a chịkwara. Atụtụ nchọcha a gbakwasara ụkwụ bụ atụtụ ntụcha ụbụbọ kempụrụiche nke Teun van Dijk. Usoro nchọcha a gbasoro bụ nke kwọlitetiv. A chọpụtara na nwoke maọbụ nwaanyị nwere ike inwe ike n’agbanyeghị na ndị Igbo na-ahụkarị nwoke dịka isi n’ihe ọbụla gbasara ndụ. Nchọcha a gbalịkwara inyocha ụzọ dị iche iche agwa nwoke na nke nwaanyị si chịkwaa mmụọ na ụbụrụ agwa ndị ọzọ n’Ihe ọjọọ gbaa afọ. Usoro ndị a gụnyere alụmalụ, asị, aghụghọ, omenaala, ịda nha, akụnụba, mma, ọnọdụ maọbụ ọkwa. Dịka o si pụta ihe n’iduuazị e nyochara, ike abụghị ihe na-adịgịde. Jenda ọbụla ji ike nwere ike iji ya chịkwaa mmụọ jenda ọbụla ọ chọrọ. Iwu obodo dịka omenala na ewumewu na-enye aka ime ka nwoke maọbụ nwaanyị nwee ike. Nke a bụ eziokwu maka na ihe obodo nabatara na-etinye mmadụ n’ọnọdụ jenda.
Article Details

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial-NoDerivatives 4.0 International License.